YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 36

36
1Ndi-isi nke ndi bu nna nke ab͕uru umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase, n'etiti ab͕uru umu Josef, we biarue nso, kwue okwu n'iru Moses, na n'iru ndi-isi, bú ndi-isi nke ndi bu nna nke umu Israel: 2ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n'ihe-nketa n'ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n'ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom. 3Ma asi na ha gāghọrọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu ebo ọzọ nke umu Israel nwunye, agāgupu kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke nna-ayi-hà, tukwasi ya n'ihe-nketa ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ya n'ihe ife-nzà nke ihe-nketa-ayi. 4Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n'ihe-nketa ebo nna-ayi-hà. 5Moses we nye umu Israel iwu n'okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu. 6Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n'anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye. 7Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu: n'ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa ebo nna-ya-hà. 8Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n'ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n'ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà. 9Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu; n'ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa nke aka ya. 10Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere: 11Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha. 12Ọ bu ndikom nke sitere n'ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n'ebo nke ab͕uru nna-ha.
13Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 36: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in