YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 11

11
Abù Oma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid.
1Na Jehova ka m'b͕abàworo:
Ùnu si aṅa si nkpuru-obim,
Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?
2N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya,
Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta,
Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri.
3N'ihi na anākwada ide nile;
Gini ka onye ezi omume meworo?
4Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ,
Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di;
Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.
5Jehova n'anwa onye ezi omume:
Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.
6Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo;
Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.
7N'ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n'anya:
Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 11: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in