YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 14

14
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid.
1Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.
Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú;
Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya,
Ihu ma ọ di onye nwere uche,
Nke nāchọ Chineke.
3Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri;
Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.
4Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?
Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m,
Ma ha akpọkughi Jehova.
5N'ebe ahu ka ha turu oké egwu;
N'hi na Chineke nọ n'ọb͕ọ onye ezi omume.
6Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere,
N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya.
7Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta!
Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata,
Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in