YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 38

38
Abù Ọma Devid, ime ka echeta echeta.
1Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi:
Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,
Aka-Gi adakwasiwokwam.
3Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi;
Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.
4N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim:
Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.
5Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,
N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.
6Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;
Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.
7N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;
Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.
8Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:
Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.
9Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;
Ize-umem ezonarighi kwa Gi.
10Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:
Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.
11Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;
Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.
12Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;
Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,
Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.
13Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;
Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.
14E, adim ka madu nke nādighi-anu ihe
Onye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya.
15N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo:
Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem.
16N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum:
Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem.
17N'ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi,
Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile.
18N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem;
M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem.
19Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume:
Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n'uzọ okwu-ugha.
20Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe
Nēmegidem, n'ihi na anamab͕aso ezi ihe.
21Arapulam, Jehova:
Chinekem, anọlam n'ebe di anya.
22Bia ọsọsọ iyerem ka,
Onye-nwe-ayi, bú nzọputam.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 38: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in