YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 52

52
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Maschil Devid: mb͕e Doeg, bú onye Edom, biara gosi Sọl, si ya, Devid bara n'ulo Ahimelek.
1Gini mere i nēto onwe-gi n'ihe ọjọ, gi dike?
Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile.
2Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè;
Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.
3I huwo ihe ọjọ n'anya kari ezi ihe;
Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume. Selah
4I huwo okwu nile nēloda eloda n'anya,
Gi ire aghughọ.
5Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi,
Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi,
Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah
6Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu,
Chì kwa ya ọchi, si,
7Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike;
Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya,
Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.
8Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke:
Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi.
9M'gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I meworo ya:
M'gēle kwa anya aha-Gi, n'ihi na ọ di nma, niru ndi-ebere-Gi.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 52: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in