YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 73

73
Abù Ọma Esaf.
1N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ,
Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ.
2Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha;
Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu.
3N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo,
Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.
4N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha:
Ma aru-ha mara abuba.
5Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ;
Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.
6N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu;
Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.
7Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa:
Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.
8Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ:
Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu.
9Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe,
Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.
10N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a,
Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.
11Ha we si, Chìneke si aṅa mara?
Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?
12Le, ndia bu ndi nēmebi iwu;
Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.
13Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha,
N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;
14Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile,
Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.
15Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a;
Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori.
16M'we chè èchìchè imata nka,
Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam;
17Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke,
Ghọta ikpe-azu-ha.
18N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha:
I mewo ka ha darue ntikpọ.
19Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya?
Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.
20Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura;
Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.
21N'ihi na obim nāb͕ari uka,
Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua.
22Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe;
Nání anu ka m'buworo n'iru Gi.
23Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile:
I jidewo aka-nrim.
24I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum,
Emesia I gēji kwa nsọpuru naram.
25Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi?
Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa.
26Anu-arum na obim agwusiwo:
Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.
27N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì:
I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.
28Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma:
Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova,
Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 73: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in