YouVersion Logo
Search Icon

NKPUGHE 14:9-11

NKPUGHE 14:9-11 IGBOB

Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya, ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu: anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.

Video for NKPUGHE 14:9-11