YouVersion Logo
Search Icon

NDI ROM 10:11-13

NDI ROM 10:11-13 IGBOB

N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya. N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya: n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

Video for NDI ROM 10:11-13