Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 43

43
1Oké unwu ahu we sie ike n'ala ahu. 2O rue, mb͕e ha risiri ọka nke ha siri n'Ijipt bute, na nna-ha siri ha, Jeghachinu, zutara ayi nwanti ihe-oriri. 3Juda we gwa ya okwu, si, Nwoke ahu b͕asiri ayi àmà ike, si, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na nwa-nne-unu esoghi unu bia. 4Ọ buru na i nēziga nwa-nne-ayi, ka ayi na ya we yikọ je, ayi gārida, zutakwara gi ihe-oriri: 5ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n'ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia. 6Israel we si, N'ìhi gini ka unu mejọrọm, n'igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ? 7Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata? 8Juda we si Israel nna-ya, Ziga nwa-okoro ahu ka mu na ya we yikọ je, ayi gēbili kwa, je; ka ayi we di ndu, ghara inwu, ma ayi, ma gi, ma umu-ntakiri-ayi. 9Mu onwem gānọrọ ya mbe; n'akam ka i gājuta ya: ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, ọ buru kwa na akpotaghi m ya n'iru gi, emehiewokwam megide gi ubọchi ndum nile: 10n'ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n'ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia. 11Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n'ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond: 12were-kwa-nu ego okpukpu abua n'aka-unu: ego kwa nke enyegha-chiri n'ọnu akpa-unu, weghachinu ya n'aka-unu; eleghi anya ohihie-anya ka ọ bu: 13kuru-kwa-nu nwa-nne-unu, bilie, jeghachikuru nwoke ahu: 14Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.
15Ndikom ahu we were onyinye-inata-iru-ọma ahu, ọ bu kwa okpukpu ego abua ka ha were n'aka-ha, na Benjamin; ha bilie, rida n'Ijipt, guzo n'iru Josef. 16Josef we hu Benjamin n'etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n'ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n'ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n'etiti-ehihie. 17Nwoke ahu we me dika Josef siri ya; nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef. 18Ndikom ahu we tua egwu, n'ihi na emere ka ha bata n'ulo Josef; ha si, Ọ bu n'ihi ego ahu, nke enyeghachiri n'akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi. 19Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n'ọnu-uzọ ulo ahu, 20si, Biko, onye-nwem, ayi rida-tara n'ezie na nmalite izuru ihe-oriri: 21o rue, mb͕e ayi biara n'ebe inọ ọnọdu-abali, na ayi meghere akpa-ayi, ma, le, ego onye ọ bula di n'ọnu akpa-ya, bú ego-ayi n'ọtùtù-ya zuru okè; ayi ewe-ghachiwo ya n'aka-ayi. 22Ọ di kwa ego ọzọ ayi wedataworo n'aka-ayi izuru ihe-oriri: ayi amaghi onye tiyere ego-ayi n'akpa-ayi. 23Ọ si Udo diri unu, unu atula egwu: Chineke-unu, na Chineke nke nna-unu, enyewo unu àkù zoro ezo n'akpa-unu: ego-unu rurum aka. Ọ me ka Simeon pukute ha. 24Nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef, ọ nye ha miri, ha we sa ukwu-ha; ọ nye kwa inyinya-ibu nile ha nri-anu-ulo. 25Ha we dozie onyinye-inata-iru-ọma ahu rue ọbibia Josef n'etiti-ehihie: n'ihi na ha nuru na ọ bu n'ebe ahu ka ha gēri nri. 26Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya. 27Ọ jua ha ajuju bayere udo-ha, si, Ọ̀ nọ n'udo, bú nna-unu, agadi ahu onye unu kwuru okwu bayere ya? Ọ̀ nọ kwa ndu? 28Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n'udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala. 29Ọ welie anya-ya abua, hu Benjamin nwa-nne-ya, bú nwa nke nne-ya, ọ si Ọ̀ bu nka bu nwa-nne-unu nke-ntà, onye unu gwaram okwu banyere ya? Ọ we si, Ka Chineke mere gi amara, nwam. 30Josef we me ngwa; n'ihi na obi-ebere-ya nile di ọku n'aru nwa-nne-ya: ọ chọ ebe ọ gākwa ákwá; o we ba n'ime-ulo-ya, kwa ákwá n'ebe ahu. 31Ọ sa iru-ya, puta, jisie onwe-ya ike, si, Dọkwasinu nri. 32Ha we dọkwasiri ya nke ya iche, dọkwasikwara ha nke ha iche, dọkwasi-kwa-ra ndi Ijipt nke ha iche, bú ndi ya na ha nērikọ ihe: n'ihi na ndi Ijipt apughi isoro ndi-Hibru rie nri; n'ihi na ihe-árú ka nke ahu buru ndi Ijipt. 33Ha we nọdu n'iru ya, ọkpara dika ọnọdu-ọkpara-ya si di, nke-ntà kwa dika ọnọdu-nke-ntà-ya si di; ibobo we nwurita ndikom ahu n'aru n'etiti ibe-ha. 34Ewe si n'iru ya butere ha onyinye nri: ma onyinye nri Benjamin kariri onyinye nri ha nile ub͕o ise. Ha we so ya ṅu ihe-ọṅuṅu, we ṅujue afọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 43: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye