1
Jenesis 13:15
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.
Krahaso
Eksploroni Jenesis 13:15
2
Jenesis 13:14
Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, ONYENWE ANYị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
Eksploroni Jenesis 13:14
3
Jenesis 13:16
Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị.
Eksploroni Jenesis 13:16
4
Jenesis 13:8
Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne.
Eksploroni Jenesis 13:8
5
Jenesis 13:18
Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye ONYENWE ANYị nʼebe ahụ.
Eksploroni Jenesis 13:18
6
Jenesis 13:10
Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige ONYENWE ANYị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu ONYENWE ANYị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.)
Eksploroni Jenesis 13:10
Kreu
Bibla
Plane
Video