MATIU 13
13
1N'ubá»chi ahu Jisus puru n'ulo, we ná»du n'usá» okĂ© osimiri. 2OkĂ© ĂŹgwĂš madu we zuká» n'ebe á» ná», ya mere á» batara n'ubÍá», ná»du ala; ĂŹgwĂš madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ĂłtĂș. 3O we gwa ha á»tutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, á»gha-nkpuru puru ka á» gha nkpuru; 4mbÍe á» nÄgha, ufá»du we da n'akuku uzá», anu-ufe we bia tĂčturie ha: 5nkpuru á»zá» we da n'ebe nkume, ebe ha nÄnweghi ĂĄjĂĄ ri nne: ngwa ngwa ha we pĂșlite, n'ihi na ha enweghi ĂĄjĂĄ di omimi: 6ma mbÍe anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpá»nwua, n'ihi na ha enweghi nkpá»rá»gwu. 7Nkpuru á»zá» we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpabÍue ha. 8Nkpuru á»zá» we da n'ala di nma, ha we nÄmi nkpuru, otĂč á»gu ise, á»zá» á»gu atá», á»zá» orĂș na iri. 9Onye nwere nti, ya nu.
10Ndi nÄso uzá»-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ĂŹhi gini ka I nÄgwa ha okwu n'ilu? 11O we za, si ha, á» bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu. 12N'ihi na onye á» bula nke nwere, onye ahu ka agÄnye, á» gÄnwebiga kwa ĂłkĂš: ma onye á» bula nke nÄnweghi, á»bunĂĄ ihe o nwere ka agÄnapu ya. 13N'ihi nka ka M'nÄgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'á»huhu, ha adighi-anu kwa n'á»nunu, ha adighi-anuta kwa. 14Ma anÄmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si,
N'á»nunu unu gÄnu, ma unu agaghi-anuta ma-á»li;
N'á»huhu unu gÄhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-á»li:
15N'ihi na obi ndi nka mara abuba,
Nti-ha kpá»chi-kwa-ra,
Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;
Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzá» ma eleghi anya,
Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,
Ghara kwa iwere obi-ha ghá»ta,
Ghara kwa ichighari,
Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
16Ma ngá»zi nÄdiri anya-unu, n'ihi na ha nÄhu uzá»; na nti-unu, n'ihi na ha nÄnu ihe. 17N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru á»tutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nÄhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nÄnu, ma ha anughi ha. 18Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke á»gha-nkpuru ahu. 19MbÍe onye á» bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma á» ghá»taghi ya, ajá» onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzá». 20Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nÄnu okwu ahu, ngwa ngwa o were á»áč
Ăč jide ya; 21ma o nweghi nkpá»rá»gwu nime onwe-ya, kama á» nÄná» nwa oge; ma mbÍe nkpabÍu ma-á»bu nsobÍu putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa á» ma n'á»nyĂ . 22Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nÄnu okwu ahu; ma nchebÍu nke oge a na aghughá» nke Ă kĂč nÄkpabÍu okwu ahu, o we ghá» ihe nÄmighi nkpuru. 23Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nÄnu okwu ahu, we ghá»ta ya; onye nÄmi nkpuru n'ezie, miputa, otĂč á»gu ise, á»zá» á»gu atá», á»zá» orĂș na iri.
24O were ilu á»zá» che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mbÍe á» ghara nkpuru á»ma n'ubi-ya: 25ma mbÍe madu nÄraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti á»ka, we la. 26Ma mbÍe npute puru, we mia nkpuru, mbÍe ahu ata ahu puta-kwa-ra ĂŹhĂš. 27Ndi-orĂč nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru á»ma n'ubi-gi? ĂČle ebe kwa ka o si nwe ata? 28á» si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orĂč-ya we si ya, Ă nÄchá» kwa ka ayi je chiká»puta ha? 29Ma á» si, Ă-Ăš; ka unu we ghara iropu ha na á»ka ma eleghi anya, mbÍe unu nÄchiká»puta ata. 30Rapunu ha abua ka ha nÄbaká»ta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gÄsi ndi nÄwe ihe-ubi, Burunu uzá» chiká»ta ata ahu, ke kwa ha n'ĂčkwĂč ka unu rechapu ha á»ku: ma kpoká»tanu á»ka ahu n'á»ba nkem.
31O were ilu á»zá» che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya: 32nke á» bu ezie na á» di ntĂ kari nkpuru nile; ma mbÍe á» bara uba, o bĂčkari ihe nile anÄku n'ubi, we ghá» osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nÄná» n'alaka-ya.
33á» turu ha ilu á»zá», si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nÄko achicha, nke nwanyi were, zobe na mbÍĂ© utu á»ka atá», rue mbÍe utu á»ka ahu dum kosiri.
34Okwu nile ndia ka Jisus gwara ĂŹgwĂš madu nile n'ilu; ma O jighi ilu á» dighi-agwa ha okwu á» bula: 35ka okwu ekwuru site n'á»nu onye-amuma we mezu, si,
M'gÄsaghe á»num n'itu ilu;
M'gÄkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntá»-ala uwa.
36MbÍe ahu á» rapuru ĂŹgwĂš madu nile, we bĂ n'ulo-ha: ndi nÄso uzá»-Ya we biakute Ya, si, Ká»rá» ayi isi ilu ata di n'ubi ahu. 37O we za, si, Onye nÄgha nkpuru á»ma ahu bu Nwa nke madu; 38ubi ahu bu uwa; nkpuru á»ma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajá» onye ahu; 39onye-iro ahu nke ghara ha bu ekwensu: owuwe-ihe-ubi bu á»gwugwu oge a; ndi ahu nÄwe ihe-ubi bu ndi-má»-ozi. 40Ya mere dika anÄchiká»puta ata rechapu kwa ha n'á»ku; otĂș a ka á» gÄdi n'á»gwugwu oge a. 41Nwa nke madu gÄzipu ndi-má»-ozi-Ya, ha gÄchiká»puta n'ala-eze-Ya ihe nile nÄme ka ama n'á»nyĂ , na ndi nÄme ihe nÄmebi iwu, 42ha gÄtubĂ kwa ha n'okĂ© á»ku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ĂĄkwĂĄ na ita-ikekere-ezĂ© ahu gÄdi. 43MbÍe ahu ka ndi ezi omume gÄnwupu dika anyanwu n'ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu.
44Ala-eze elu-igwe yiri Ă kĂč ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'á»áč
Ăč-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu.
45á»zá» kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nÄchá» pearl á»ma: 46ma mbÍe á» huru otĂč pearl di okĂ© á»nu-ahia, á» je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya.
47á»zá» kwa, ala-eze elu-igwe yiri okĂ© ĂșbÍĂș awuyere nime okĂ© osimiri, nke kpoká»ta-kwa-ra ufá»du n'aha azĂč nile di iche iche: 48nke, mbÍe o juru, ha dá»gotara ya n'ĂłtĂș; ha we ná»du, chiká»ta azĂč di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nÄdighi nma. 49OtĂș a ka á» gÄdi n'á»gwugwu oge a: ndi-má»-ozi gÄputa, kewaputa ndi bu ajá» madu n'etiti ndi ezi omume, 50ha gÄtubĂ kwa ha n'okĂ© á»ku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ĂĄkwĂĄ na ita-ikekere-ezĂ© ahu gÄdi.
51Ănu aghá»tawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E. 52O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwá» á» bula nke emere ka á» buru onye nÄso uzá» ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nÄsi n'Ă kĂč-ya atuputa ihe á»hu na ihe ochie.
53O rue, mbÍe Jisus tubĂŹri ilu ndia, O si n'ebe ahu zá»lie. 54O we bia n'ala nke aka Ya, nÄzĂ ha ihe n'ulo-nzuká»-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Ăle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na á»lu ndia di ike? 55Nwoke a, ĂÌŁ bughi Nwa onye-ĂČÌŁkĂ -ayi? Ă dighi-akpá» nne-Ya Meri? nĂ umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas? 56Na umu-nne-Ya ndinyom, hĂ nile aná»ghi n'etiti ayi? Ăle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile? 57Ewe me ka ha ma n'á»nyĂ n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anÄdighi-asá»puru, ma-á»bughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya. 58á» lughi kwa á»tutu á»lu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.