1
1 Ndị Tesalonaịka 5:16-18
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
Compare
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:16-18
2
1 Ndị Tesalonaịka 5:23-24
Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:23-24
3
1 Ndị Tesalonaịka 5:15
Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:15
4
1 Ndị Tesalonaịka 5:11
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:11
5
1 Ndị Tesalonaịka 5:14
Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:14
6
1 Ndị Tesalonaịka 5:9
Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:9
7
1 Ndị Tesalonaịka 5:5
Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị.
Explore 1 Ndị Tesalonaịka 5:5
Home
Bible
Plans
Videos