Eze ga-eru ụjụ,
nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe,
aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu.
Aga m emeso ha dịka omume ha si dị,
aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị.
“ ‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị.’ ”