“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.
Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.
Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,
Izrel ga-ebikwa nʼudo.
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:
ONYENWE ANYị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.