1
Jeremaya 29:11
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka ONYENWE ANYị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
Compare
Explore Jeremaya 29:11
2
Jeremaya 29:13
Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
Explore Jeremaya 29:13
3
Jeremaya 29:12
Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị.
Explore Jeremaya 29:12
4
Jeremaya 29:14
Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.
Explore Jeremaya 29:14
5
Jeremaya 29:10
Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.
Explore Jeremaya 29:10
Home
Bible
Plans
Videos