Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, kwuo sị:
“Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta
nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa.
ONYENWE ANYị nyere ihe niile, ONYENWE ANYị ewerekwala ihe niile,
ka aha ONYENWE ANYị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”
Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.