1
Matiu 27:46
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
Compare
Explore Matiu 27:46
2
Matiu 27:51-52
Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie.
Explore Matiu 27:51-52
3
Matiu 27:50
Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume.
Explore Matiu 27:50
4
Matiu 27:54
Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
Explore Matiu 27:54
5
Matiu 27:45
Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile.
Explore Matiu 27:45
6
Matiu 27:22-23
Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
Explore Matiu 27:22-23
Home
Bible
Plans
Videos