Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,
Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;
Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala,
We wezuga obi-gi inwe nghọta;
E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,
Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;
Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,
Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:
Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,
Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.