Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,
Ya na madu nke nēnweputa nghọta.
N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,
Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.
Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:
Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.