YouVersion Logo
Search Icon

Diuteronomi Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ihe dị nʼakwụkwọ a bụ okwu niile Mosis gwara ụmụ Izrel nʼobosara ala Moab tupu ha amalite ịbanye nʼala Kenan. Nʼokwu ya, Mosis kpọtụrụ uche ha nʼihe gbasara ihe niile dakwasịrị ha nʼoge gara aga, rịọsie ha arịrịọ ike sị ha rubere Chineke isi, ma tụkwasịkwa obi ha na nchebe ya. Ọ kpọkuru ndị Izrel niile sị ha werekwa onwe ha nyefee ọzọ nʼọrụ ahụ Chineke tinyere ha nʼaka ịrụ. Emesịa, o duru ha ịbụ abụ na ofufe nke ha fere Chineke. Mgbe a họpụtasịrị Joshua dị ka onyendu ọhụrụ ha nwere, Mosis hapụrụ ndị Izrel, pụọ gaa ebe ọ nọ nwụọ.
Usoro e si dee ya:
Okwu mbụ Mosis gwara ụmụ Izrel 1–4
Okwu nke abụọ Mosis gwara ụmụ Izrel 5–26
Okwu gbasara iwu dị iche iche 27–28
Okwu Mosis na nhọpụta Joshua 29:1–32:43
Okwu ikpeazụ Mosis kwuru na ọnwụ ya 32:44–34:12

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in