YouVersion Logo
Search Icon

Ndị Galeshịa Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ọ bụ Pọl kwusara oziọma mere ka e nwee nzukọ Kraịst nʼakụkụ Galeshịa. Ma mgbe ọ pụrụ gaa ikwusa oziọma nʼebe ọzọ ndị nkuzi ụgha bịakwutere ndị Galeshịa sị ha na o zughị oke bụ ikwere naanị na Kraịst, na ihe ọzọ fọdụrụ ha ga-eme tupu azọpụta ha. Ihe a ha ga-eme bụ idebezu iwu na omenaala ndị Juu. Pọl kwuru okwu megide ozizi ọjọọ a nʼakwụkwọ a. O gosiri na mgbaghara mmehie na nzọpụta na-adị naanị site nʼamara Chineke, nke na-erute onye ọbụla nwere okwukwe nʼime Kraịst.
Usoro e si dee ya:
Pọl akọwaa onwe ya, kọwaakwa oziọma 1–2
Mnwere onwe site nʼibu ọnụ nke idebe iwu 3:1-22
Izuoke nke oziọma 3:23–4:31
Inwe onwe nke onye Kraịst 5
Ibi ndụ nke onye Kraịst 6

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in