Matiu 1
1
Usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst ahụ
1Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
2Ebraham mụrụ Aịzik,
Aịzik amụọ Jekọb,
Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
3Juda mụtara Perez na Zera site na Tama,
Perez mụrụ Hezrọn,
Hezrọn amụọ Aram.
4Aram mụrụ Aminadab,
Aminadab mụrụ Nashọn,
Nashọn amụọ Salmọn.
5Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab,
Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut,
Obed amụọ Jesi.
6Jesi amụọ Devid, bụ eze.
Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
7Solomọn mụrụ Rehoboam,
Rehoboam amụọ Abija,
Abija amụọ Esa.
8Esa mụrụ Jehoshafat,
Jehoshafat amụọ Joram,
Joram amụọ Ụzaịa.
9Ụzaịa mụrụ Jotam,
Jọtam amụọ Ehaz,
Ehaz amụọ Hezekaya.
10Hezekaya mụrụ Manase,
Manase amụọ Emọn,
Emọn amụọ Josaya.
11Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
12Mgbe ha si Babilọn lọta
Jekonaya mụrụ Shealtiel,
Shealtiel amụọ Zerubabel.
13Zerubabel mụrụ Abiud,
Abiud amụọ Eliakịm,
Eliakịm amụọ Azoa.
14Azoa mụrụ Zadọk,
Zadọk amụọ Akịm,
Akịm amụọ Eliud.
15Eliud mụrụ Elieza,
Elieza amụọ Matan,
Matan amụọ Jekọb.
16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
Josef anabata Jisọs dịka nwa ya nwoke
18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst#1:18 Maọbụ, Onye nzọpụta siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,#1:21 Jisọs nke a bụ otu ndị Griik si akpọ Joshua nke pụtara Onyenwe anyị na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel”#1:23 Aịz 7:14 (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
Currently Selected:
Matiu 1: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.