YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 7

7
Abụ Ọma 7
Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin.
Arịrịọ maka ikpe ziri ezi
1 Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara;
zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm,
ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a;
ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ,
maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m;
ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m,
mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela
6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị,
bilie megide oke iwe ndị iro m;
teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu,
ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe.
Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị,
na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
9O Chineke onye ezi omume,
onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ,
mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe
meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta#7:10 Maọbụ, Onyenwe m m,
ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị,
ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ,
ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
13Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ;
ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
14Onye ọbụla dị ime ajọ ihe,#7:14 Nʼoge ochie, ndị agha izipụta echiche ime ajọ ihe ha, na-eji ihe na-aghọrọ ọkụ ọsịịsọ, techie nʼọnụ àkụ ha, mụnye ha ọkụ, tụnye ha nʼelu ụlọ ndị iro ha, i gbaa ha ọkụ.
na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
15Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba
nʼime olulu ahụ o gwuru.
16Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya
ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
17Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,
aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.

Currently Selected:

Abụ Ọma 7: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for Abụ Ọma 7