YouVersion Logo
Search Icon

I. TIMỌTI 2

2
1Ya mere ihe mbu m'nādusi ọdu ike bu, ka anāriọ aririọ, kpe kwa ekpere, riọ kwa aririọ anāriọrọ ndi ọzọ, kele kwa ekele, n'ihi madu nile; 2n'ihi ndi-eze na ndi nile nọ n'ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile. 3Nka di nma buru kwa ihe agānara nke-ọma n'iru Onye-nzọputa-ayi, bú Chineke; 4Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu. 5N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus, 6Onye nyere Onwe-ya ka Ọ buru ihe-nb͕aputa n'ihi madu nile; nke agāb͕a àmà-ya n'oge nke aka ya; 7nke edebere mu onwem ka m'buru onye-nkwusa na onye-ozi ka m'we b͕a àmà ahu (anamekwu ezi-okwu, ekwughm okwu-ugha), ibu kwa onye-ozizí nke ndi mba ọzọ nime okwukwe na ezi-okwu.
8Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka. 9Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia; 10kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma. 11Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile. 12Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ. 13N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv; 14ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie: 15ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

Currently Selected:

I. TIMỌTI 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for I. TIMỌTI 2