YouVersion Logo
Search Icon

II. IHE EMERE 28

28
1OrĂș arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid nna-ya: 2kama o jere ije n'uzọ nile nke ndi-eze Israel, ọzọ kwa, o mere arusi awuru awu nye Bealim. 3Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsĂŹ isĂŹ utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-ĂĄrĂș nile nke mba ọzọ si di, bĂș ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. 4Ọ chua aja, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsĂŹ Ă­sĂŹ utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntĂ  nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula. 5Jehova, bĂș Chineke-ya, we nye ya n'aka eze Siria; ha we tib͕ue ya, si nime ndi-ya dọta ndọta-n'agha uku, me ka ha biarue Damaskọs. Ọzọ kwa, n'aka eze Israel ka enyere ya, o we tib͕ue ya okĂ© ntib͕u. 6Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orĂș nnĂč ndikom uzọ iri-na-ise n'otĂč ubọchi, ha nile bu ndi-dĂŹnkpĂ ; n'ihi na ha rapuru Jehova, bĂș Chineke nke ndi bu nna-ha. 7Zikri, bĂș dike nke Efraim, we b͕ue Maaseia nwa eze, na Azrikam, bĂș onye-ndĂș nke ulo, na Elkena nke bu-kwa-ra eze dika onye nke-abua. 8Umu Israel we dọta n'agha nime umu-nne-ha orĂș nnĂč madu orĂș uzọ na uzọ ise, bĂș ndinyom, na umu-ndikom, na umu-ndinyom, ọzọ kwa, ọtutu ihe-nkwata ka ha lutara n'aka-ha n'agha, ha we webata ihe-nkwata ahu na Sameria. 9Ma otĂč onye-amuma Jehova nọ n'ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n'ihi na Jehova, bĂș Chineke nke nna-unu-hĂ , kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n'aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha. 10Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orĂč na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ĂŹhe ikpe-ọmuma adighi kwa n'etiti unu n'ebe Jehova, bĂș Chineke-unu, nọ? 11Ma ub͕u a nurunum, zighachi ndọta-n'agha ahu, nke unu dọtara n'agha site n'umu-nne-unu: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova di n'aru unu. 12Ndikom ufọdu nime ndi-isi umu Efraim, bĂș Azaraia nwa Jehohanan, na Berekaia nwa Meshilemot, na Jehizkia na Shalum, na Amasa nwa Hadlai, we bilie imegide ndi nēsi n'usu-ndi-agha bia, 13ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n'agha ahu n'ebe a: n'ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n'ikpe-ọmuma-ayi: n'ihi na o riri nne, bĂș ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n'aru Israel. 14Ndi ejikere agha we rapu ndọta-n'agha ahu na ihe-nluta-n'agha ahu n'iru ndi-isi na nkpọkọta ahu nile. 15Ndikom ahu ndi akpọrọ n'aha n'aha we bilie, jide ndọta-n'agha ahu, yikwasi ndi-ha b͕ara ọtọ uwe site n'ihe-nkwata ahu, ha we yikwasi ha uwe, yikwasi kwa ha akpukpọ-ukwu, me ha ka ha rie ihe, me kwa ha ka ha áč…ua ihe-ọáč…uáč…u, te ha manu, nēdu ha n'elu inyinya-ibu, bĂș onye ọ bula nāsu ngọngọ, ha we me ka ha biarue Jeriko, bĂș obodo ukwu, di umu-nne-ha nso: ha we laghachi na Sameria.
16Na mb͕e ahu ka eze, bĂș Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka. 17Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha. 18Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu. 19N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bĂș eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova. 20Tilgat-pilnesa, bĂș eze Asiria, we biakute ya, kpab͕ue ya, ma o meghi ya ka ọ di ike. 21N'ihi na Ehaz kĂšre ulo Jehova, na ulo eze na ndi-isi, nye eze Asiria ĂČkĂš: ma ọ bughi ihe yere ya aka. 22Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bĂș eze Ehaz nka. 23O we chuara chi nile nke Damaskọs Ă jĂ , bĂș ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru Ă jĂ , ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ. 24Ehaz we chikọta ihe nile nke ulo Chineke, b͕u ngwongwo ihe nile nke ulo Chineke, mechie ọnu-uzọ nile nke ulo Jehova, mere onwe-ya ebe-ichu-Ă jĂ  di iche iche nime nkuku nile nime Jerusalem. 25N'obodo nile ọ bula nke Juda ka o me-kwa-ra ebe di elu isurere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsĂŹ Ă­sĂŹ utọ, o we kpasue Jehova, bĂș Chineke nke nna-ya-hĂ , iwe. 26Ma ihe nile o mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel. 27Ehaz we so nna-ya-hĂ  dina n'ọnwu, ha we lĂŹe ya n'obodo ahu, bĂș nime Jerusalem; ma ha ebubataghi ya n'Ă­lĂŹ ndi-eze Israel: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Currently Selected:

II. IHE EMERE 28: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in