YouVersion Logo
Search Icon

ỌLU NDI-OZI 18

18
1Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint. 2O we hu otù onye-Ju, aha-ya bu Akwila, onye Pọntọs n'ọmumu-ya, onye siworori n'Itali bia ọhu, ya na nwunye-ya Prisila, n'ihi na Klọdiọs nyereri iwu ka ndi-Ju nile si na Rom pua: o we biakute ha; 3n'ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n'ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū. 4O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye.
5Ma mb͕e Sailas na Timọti si na Masedọnia ridata, okwu Chineke nēb͕u Pọl nb͕u n'obi, ọ nāgwasi ndi-Ju ike na Jisus bu Kraist-ha. 6Ma mb͕e ha nēdo onwe-ha n'usoro imegide ya, nēkwulu kwa ya, o fecha uwe-ya, si ha, Ọbara-unu di n'isi-unu; mu onwem di ọcha: site n'ub͕u a m'gāgakuru ndi mba ọzọ. 7O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo otù onye, aha-ya bu Taitọs Justọs, onye nāsọpuru Chineke, onye ulo-ya di ulo-nzukọ, ahu ezi nso. 8Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism. 9Onye-nwe-ayi we site n'ọhù gwa Pọl okwu n'abali, si, Atula egwu, kama nēkwu, ekpuchi-kwa-la ọnu-gi: 10n'ihi na Mu onwem nọyere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n'ihi na enwerem ọtutu madu n'obodo a. 11O we nọdu n'ebe ahu otù arọ na ọnwa isi, nēzí okwu Chineke n'etiti ha.
12Ma mb͕e Galio bu onye-isi nke Akaia, ndi-Ju were otù obi guzo imegide Pọl, we kuta ya n'iru oche-ikpé, 13si, Onye a nārafu madu ka ha sọpuru Chineke n'uzọ megidere iwu-ayi. 14Ma mb͕e Pọl gaje isaghe ọnu-ya, Galio siri ndi-Ju, Asi na ọ bu okwu nmejọ ma-ọbu ajọ ihe jọb͕uru onwe-ya, unu ndi-Ju, ọ gēkwesi ka m'nagide unu: 15ma ọ buru na ha bu ajuju bayere okwu-ọnu di iche iche na aha di iche iche na iwu nke aka unu, unu onwe-unu le ha anya; mu onwem ezubeghi ibu onye-ikpé okwu ndia. 16O we chupu ha n'iru oche-ikpé-ya. 17Ha nile we jide Sostenis, bú onye-isi ulo-nzukọ, tie ya ihe n'iru oche-ikpé ahu. Ọ dighi kwa ihe ọ bula n'ihe ndia meturu Galio n'obi.
18Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa. 19Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu. 20Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi; 21ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ. 22Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk. 23Mb͕e ọ nọsiri n'ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n'usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike.
24Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n'ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ. 25Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn: 26onye ahu we malite ikwuwa okwu n'ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n'ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari. 27Mb͕e o zubere igabiga n'ofè ka ọ ba n'Akaia, umu-nna nime Kraist we me ka obi di ya ike, we degara ndi nēso uzọ Jisus akwukwọ inara ya nke-ọma: mb͕e o ruru, o yere ha aka nke-uku, bú ndi. kwereri site n'amara: 28n'ihi na o ji ike kwukpa ndi-Ju ọnu nke-uku, n'iru ọra madu, ebe ọ nēgosi na Jisus bu Kraist-ha site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ.

Currently Selected:

ỌLU NDI-OZI 18: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for ỌLU NDI-OZI 18