YouVersion Logo
Search Icon

ỌLU NDI-OZI 22

22
1Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n'ebe unu nọ ub͕u a.
2Mb͕e ha nuru na ọ nāgwa ha okwu n'asusu Hibru, ha we kpuchie ọnu-kari: o we si,
3Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n'obodo a, n'ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta: 4esob͕u-kwa-ram Uzọ a rue ọnwu, nēke ma ndikom ma ndinyom ab͕u nārara kwa ha nye n'ulo-nkpọrọ di iche iche. 5Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie. 6O we rue, mb͕e m'nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n'oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n'elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu. 7M'we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um? 8Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u. 9Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n'ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu. 10M'we si, Gini ka m'gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n'ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me. 11Mb͕e m'nāhughi uzọ site ebube ìhè ahu, ndi mu na ha nọ we jidem n'aka durum, m'we ba na Damaskọs. 12Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n'ebe ahu b͕ara ezi àmà, 13o we biakutem, guzo n'akukum, sim, Sọl, nwa-nnam, ka eme ka i hu uzọ. N'otù oge hour ahu ewe me ka mu onwem hu uzọ, m'we le ya anya. 14O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n'ọnu-Ya puta. 15N'ihi na i gāburu Ya onye-àmà n'ebe madu nile nọ nke ihe nile i huworo nu kwa. 16Ub͕u a kwa gini mere i nāla azu? bilie, ka eme gi baptism, sachapu kwa nmehie-gi nile, nākpọku aha-Ya. 17O we rue, mb͕e m'laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m'nēkpe kwa ekpere n'ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n'anya, 18m'we hu Ya ka Ọ nāsim, Me ngwa, si na Jerusalem pua ọsọsọ: n'ihi na ha agaghi-anara àmà bayerem n'aka-gi. 19Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n'ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n'ulo-nzukọ nile n'otù n'otù: 20mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya. 21O we sim, Ga ije-gi: n'ihi na Mu onwem gēsi n'ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n'ebe di anya.
22Ha nānu kwa olu-ya rue okwu a; ha we welie olu-ha elu, si, Wepu onye di otú a n'uwa: n'ihi na o kwesighi ka ọ di ndu. 23Mb͕e ha nēti nkpu, nēyipu kwa uwe-ha, nēkpoli kwa àjà elu, 24onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n'ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n'ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a. 25Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n'ebe ahu, Ò ziri ezi n'iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé? 26Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nuru ya, ọ jekuru onye-isi-ọchi-agha, kọrọ ya, si, Gini ka i gaje ime? n'ihi na nwoke a bu onye Rom. 27Onye-isi-ọchi-agha ahu we biakute ya, si ya, Gwam, gì onwe-gi bu onye Rom? Ọ si, E. 28Onye-isi-ọchi-agha we za, si, Oké ego ka mu onwem ji zuta ọnọdu onye amuru n'obodo Rom. Pọl we si, Ma amuru mu onwem onye Rom. 29Ya mere ndi gaje ichọputa isi okwu n'ọnu-ya si n'ebe ọ nọ pua ngwa ngwa: onye-isi-ọchi-agha we tu kwa egwu, mb͕e ọ matara na ọ bu onye Rom, na n'ihi na o kere ya-ri ab͕u.
30Ma n'echi-ya, ebe o nēzube imara isi okwu, ihe mere ndi-Ju nēbo ya ebubo, ọ tọpuru ya, we gwa ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé nile ka ha b͕akọ, ọ we kudata Pọl, guzo ya n'iru ha.

Currently Selected:

ỌLU NDI-OZI 22: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for ỌLU NDI-OZI 22