YouVersion Logo
Search Icon

DEUTERONOMI 20

20
1Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa. 2O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu, 3si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; 4n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu. 5Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke. 6Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya. 7Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya. 8Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n'ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya. 9O gēru kwa, mb͕e ndi-ọchi-agha gwabisiri ndi Israel okwu, na ha gēme ndi-isi nke usu nile nke ndi-agha ka ha buru ndi-nlekọta nēlekọta ndi Israel.
10Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo. 11O gēru kwa, ọ buru na ọ za gi okwu udo, meghe-kwa-ra gi uzọ-ya, ọ gēru kwa, na ndi nile anāhuta nime ya gāghọrọ gi ndi nēfè òfùfè, ha gēfè kwa gi òfùfè. 12Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n'udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n'agha: 13Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n'aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula: 14nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi. 15Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia. 16Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n'obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa. 17N'ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu: 18ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.
19Mb͕e i gānọchigide obodo n'agha ọtutu ubọchi, n'ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n'ifekwasi ha anyu-ike; n'ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n'ihi na osisi nke di n'ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n'iru gi na nnọchigide-n'agha ahu? 20Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.

Currently Selected:

DEUTERONOMI 20: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in