YouVersion Logo
Search Icon

ỌPUPU 27

27
1I gēme kwa ebe-ichu-àjàm ahu; ọ gābu osisi acacia, cubit ise bu ogologo-ya, cubit ise bu kwa obosara-ya; ebe-ichu-àjà ahu gēnwe akuku anọ ra nrata: cubit atọ ka idi-elu-ya gādi kwa. 2I gēme kwa mpì-ya n'elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla. 3I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me. 4I gēme-kwa-ra ya ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me; i gēme kwa nb͕a-aka ọla anọ n'elu ub͕u ọla ahu, n'elu nsọtu-ya anọ. 5I gētiye ya n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ebe-ichu-àjà ahu n'okpuru, ka ub͕u ọla ahu we rue na nkera ebe-ichu-àjà ahu. 6I gēme-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nkpa-n'aka, bú nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla. 7Agēme ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu, nkpa-n'aka ahu gādi kwa n'elu akuku abua nke ebe-ichu-aja, mb͕e anēbu ya. 8I gēwere ibo me ya ka ọ di ka ib͕e: dika emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a, otú a ka ha gēme ya.
9I gēme kwa ogige ebe-obibi ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida gēnwe ákwà-ngechi igechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo gādiri otù akuku ahu: 10ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha. 11Otú a akuku Ugwu gēnwe kwa n'ogologo-ya ákwà-ngechi ọgu cubit ise n'ogologo, ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha. 12Obo-sara ogige ahu n'akuku Ọdida-anyanwu gēnwe kwa ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri: ide-ha gādi iri, ukwu-ha iri kwa. 13Obosara ogige ahu n'akuku Iru-anyanwu nke chere iru n'ọwuwa-anyanwu gādi ọgu cubit abua na iri. 14Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa. 15Akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe kwa ákwà-ngechi cubit iri na ise: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa. 16Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa. 17Ide nile nke ogige ahu buruburu gabu ihe egegidere ngegide n'ọla-ọcha; nkpọye-ha gābu ọla-ọcha; ma ukwu-ha gābu ọla. 18Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla. 19Ihe nile nke ebe-obibi ahu n'òfùfè-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ǹtú nile nke ogige ahu, gābu ọla.
20Ma gi onwe-gi, i gēnye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum. 21N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.

Currently Selected:

ỌPUPU 27: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in