YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 14

14
1O rue, n'ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim, 2na ha buru agha megide Bira, bú eze Sọdọm, megide kwa Biasha, bú eze Gọmọra, na Shainab, bú eze Adma, na Shemiba, bú eze Zeboyim, na eze Bila (nke ahu bu Zoa). 3Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú). 4Arọ iri na abua ka ha fere Kedoalaoma, n'arọ nke-iri-na-atọ ha we nupu isi. 5N'arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n'Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim, 6na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara. 7Ha we chigharia, bia En-mishpat (nke ahu bu Kedesh), tib͕ue ndi bi n'ọhia nile nke ndi Amalek, tib͕u kwa ndi-Amorait, ndi bi na Hazazon-tema. 8Eze Sọdọm na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (nke ahu bu Zoa) we pua, do agha n'usoro imegide ha nime ndagwurugwu Sidim; 9imegide Kedoalaoma, bú eze Ilam, na Taidal, bú eze Goyim, na Amrafel, bú eze Shaina, na Ariok, bú eze Elasa; eze anọ megide eze ise ahu. 10Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu. 11Ha we chiri àkù nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe-oriri-ha nile, la. 12Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n'ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm. 13Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu. 14Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan. 15Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs. 16Ọ we chilata àkù nile, ọzọ kwa, Lot, bú nwa-nne-ya, na àkù-ya ka ọ chilatara, ndinyom kwa, na ndi ahu. 17Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze). 18Melkizedek, bú eze Selem, we buputa achicha na manya-vine: onye ahu bu kwa onye-nchu-aja diri Chineke Nke kachasi ihe nile elu. 19Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa: 20ọ bu kwa Onye agọziri agọzi ka Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu, Onye raworo ndi nākpab͕u gi nye n'aka-gi. Ọ we nye ya otù uzọ n'uzọ iri nime ihe nile. 21Eze Sọdọm we si Abram, Nyem nání nke bu madu, ma were àkù n'onwe-gi. 22Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa, 23na m'gaghi-ewere ihe ma-ọli nime ihe ọ bula nke i nwere, site n'ogho we rue eriri-akpukpọ-ukwu, ka i we ghara isi, Mu onwem emewo Abram ka ọ buru ọgaranya. 24Ka ihe ọ bula ghara idirim: nání ihe nke umu-okorọbia ndia riri, na òkè nke ndikom ahu mu na ha yikọrọ je: Ana, na Eshkol, na Mamre, ka ha onwe-ha were òkè-ha.

Currently Selected:

JENESIS 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in