YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 46

46
1Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja. 2Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam. 3Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n'Ijipt; n'ihi na mba uku ka M'gēme gi ka i ghọ n'ebe ahu. 4Mu onwem gēso gi rida n'Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n'ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua. 5Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya. 6Ha chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, bú nke ha kpatarari n'ala Kenean, bata n'Ijipt, bú Jekob na nkpuru-ya nile tiyere onwe-ya: 7ya na umu-ya ndikom, na umu-ndikom nke umu-ya ndikom, umu-ya ndinyom, na umu-ndinyom nke umu-ya ndikom, ọ bu nkpuru-ya nile ka o mere ka ha so ya bata n'Ijipt.
8Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n'Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben. 9Umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. 10Umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoba, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu. 11Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari. 12Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul. 13Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron. 14Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel. 15Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ 16Umu-ndikom Gad; Zifyon, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Iri, na Arodi, na Areli. 17Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi: umu-ndikom Beria kwa; Heba na Malkiel. 18Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia, bú nkpurui-obi iri na isi. 19Umu-ndikom Rechel, bú nwunye Jekob; Josef na Benjamin. 20Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya. 21Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad. 22Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile di iri na anọ. 23Umu-ndikom Dan; Hushim. 24Umu-ndikom Naftali; Jahzeel, na Guni, na Jiza, na Shilem. 25Ndia bu umu-ndikom Bilha, onye Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia: nkpuru-obi nile di asa. 26Nkpuru-obi nile Jekob nwere ndi batara n'Ijipt, ndi siri n'úkwù-ya puta, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na isi; 27umu-ndikom Josef, ndi amuru nye ya n'Ijipt, di kwa nkpuru-obi abua; nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi nābata n'Ijipt, di ọgu atọ na iri.
28Ma ọ bu Juda ka o zigara n'iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n'iru ya rue Goshen; ha we bata n'ala Goshen 29Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya. 30Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a. 31Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n'ala Kenean, abiakutewom; 32ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo. 33Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu? 34na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.

Currently Selected:

JENESIS 46: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in