YouVersion Logo
Search Icon

JOB 19

19
1Job we za, si,
2Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú?
Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?
3Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem:
Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm.
4Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n'amaghi-ama,
Ma n'ebe m'nọ ka nmehiem m'mehiere n'amaghi-ama di.
5Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku,
Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:
6Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ,
Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.
7Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam:
Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.
8Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa,
N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.
9O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe,
We wezuga okpu-eze n'isim.
10Ọ nākwatum buruburu, m'we la:
O we ropu olile-anyam dika osisi.
11O me ka iwe-Ya di ọku imegidem,
Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.
12Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem,
Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.
13O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya,
Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ.
14Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo,
Ndi m'mara echezọwokwam.
15Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ:
Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha.
16Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam,
Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.
17Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ,
Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.
18Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom;
Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem.
19Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú:
Ndi ahu m'huru n'anya echighariwo imegidem.
20Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum,
M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem.
21Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm;
N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.
22N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke?
N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?
23Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a!
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo!
24Ma asi na eji pen ígwè na òpù
Ka ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!
25Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu,
Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu:
26Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka,
Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke:
27Onye mu onwem gāhuru onwem,
Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ.
Akurum abua agwusiwo n'imem.
28Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya?
Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;
29Tuanu ujọ n'iru mma-agha:
N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha,
Ka unu we mara na ikpé di.

Currently Selected:

JOB 19: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in