YouVersion Logo
Search Icon

JOB 25

25
1Bildad, bú onye Shua we za, si,
2Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya;
O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu.
3Usu-Ya, hà nwere ọnu-ọgugu?
Ònye kwa ka ìhè-Ya nādighi-awakwasi?
4Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?
Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n'obi, bú onye nwayi muru?
5Le, ọbuná ọnwa adighi-eti,
Ọzọ, kpakpando adighi ọcha n'anya-Ya:
6Ò gēsi kwa aṅa di ọcha, bú madu, nke bu nání ikpuru?
Ma-ọbu nwa nke madu, nke bu nání idide?

Currently Selected:

JOB 25: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in