YouVersion Logo
Search Icon

JOB 37

37
1Ọzọ, obim nāma jijiji bayere nka,
Ọ nēme kwa nkpatu pua n'ọnọdu-ya.
2Genu nti nke-ọma n'ime-nkpatu nke olu-Ya,
Na ntamu nke nēsi n'ọnu-Ya puta.
3N'okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya,
Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa.
4Mb͕e ọ gasiri olu nāb͕ọ uja;
Ọ nēwere olu nbili-elu-Ya ma éb͕è-elu-igwe:
Ọ dighi-eb͕ochi ha mb͕e anānu olu-Ya.
5Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube;
Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha.
6N'ihi na Ọ nāsi snow,
Na oké miri-ozuzo,
Na oké miri-ozuzo nke miri-ozuzo-Ya di ike, Di n'ala.
7Ọ nākachi aka madu ọ bula akàra;
Ka madu nile O mere we mara ya.
8Anu-ọhia we nābà n'ọ̀té-ya,
Ọ nānọdu kwa n'ebe-obibi-ya.
9N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia:
Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia.
10Anēsi n'iku-ume Chineke nye ice:
Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara.
11Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji;
Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya:
12Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya,
Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwu
N'elu-uwa dum madu bi:
13Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya,
Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.
14Ṅa nti na nka, Job:
Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.
15Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu,
Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?
16Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe,
Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe?
17Gi onye uwe-gi nēkpo ọku,
Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida.
18Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara,
Nke di ike dika enyo awuru awu?
19Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya;
Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri.
20Àgākọrọ Ya na m'gēkwu okwu?
Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya?
21Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé:
Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha.
22N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia:
Chineke ka ebube di egwu nādikwasi.
23Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike:
N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.
24N'ihi ya madu nātu egwu Ya:
Ọ dighi-ahu ndi nile obi-ha mara ihe.

Currently Selected:

JOB 37: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in