YouVersion Logo
Search Icon

LEVITIKỌS 19

19
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di. 3Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 4Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 5Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ. 6N'ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n'ọku ka agēsure ya. 7Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n'ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ: 8ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.
9Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru 10Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n'ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 11Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n'ebe ibe-ya nọ. 12Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova. 13Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu. 14Akọchala onye nti chiri, etiye-kwa-la ihe-isu-ngọngọ n'iru onye-ìsì, ma tua egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova. 15Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe. 16Ejegharila n'etiti umu-nna-gi dika onye nāb͕a àmà ọjọ: eguzola imegide ọbara madu-ibe-gi: Mu onwem bu Jehova. 17Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya. 18Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova. 19Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi. 20Ma mb͕e nwoke soro nwayi dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ma nwayi ahu bu nwayi nēje ozi, nke nwoke kwere ilu, nke anāb͕aputaghi ma-ọli, nke anēmeghi kwa ka ọ nwere onwe-ya: nchọputa okwu ahu gādi; agaghi-eme ka ha nwua, n'ihi na emeghi ka nwayi ahu nwere onwe-ya. 21O gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, bú ebulu ibu àjà-ikpe-ọmuma. 22Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo. 23Ma mb͕e unu gābà n'ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n'ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya. 24Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova. 25Ma n'arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 26Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ. 27Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi. 28Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova. 29Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ. 30Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova. 31Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 32I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova. 33Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike. 34Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 35Unu emela ajọ omume-n'ikpé, ma-ọbu n'itù ihe, ma-ọbu n'isi ihe, ma-ọbu n'itù ihe di miri miri. 36Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta. 37Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

Currently Selected:

LEVITIKỌS 19: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in