YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 17

17
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Gwa umu Israel okwu, nara kwa n'aka-ha nkpa-n'aka nkpa-n'aka, otù diri otù ulo nna, n'aka ndi-isi ha nile, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nkpa-n'aka iri-na-abua: aha nwoke ọ bula ka i gēdekwasi na nkpa-n'aka-ya 3Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n:aka Livai: n'ihi na ọ bu otù nkpa-n'aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe. 4I gēdo kwa ha n'ulo-ikwū n'iru ihe-àmà ahu, ebe Mu na unu nēzute. 5O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu. 6Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n'aka iri na abua: nkpa-n'aka Eron di kwa n.etiti nkpa-n'aka-ha. 7Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà. 8O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha. 9Moses we si n'iru Jehova chiputara umu Israel nile nkpa-n'aka ahu nile: ha we le anya, were ha, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya. 10Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu. 11Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere.
12Umu Israel we gwa Moses okwu, si, Le, ayi ekubìwo, ayi alawo n'iyì, ayi nile alawo n'iyì. 13Onye ọ bula nke nābiaru nso, nke nābiaru nso ebe-obibi Jehova, gānwu: ọ̀ bu na ayi agwusiwo n'ikubì ekubì?

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 17: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in