YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 9

9
1Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'arọ nke-abua nke nputa ha si n'ala Ijipt puta, n'ọnwa mbu, si, 2Ka umu Israel me kwa ememe ngabiga na mb͕e-ya akara àkà. 3N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya. 4Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu. 5Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere. 6Ma ndikom ufọdu di, ndi bu ndi ruru árú site n'ozu madu, ha apughi kwa ime ememe ngabiga ahu n'ubọchi ahu: ha we biaru nso n'iru Moses na n'iru Eron n'ubọchi ahu: 7ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n'ozu madu: n'ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n'etiti umu Israel? 8Moses we si ha, Guzonu; ka m'we nu ihe Jehova gēnye n'iwu bayere unu.
9Jehova we gwa Moses okwu, si, 10Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ọ bula n'etiti unu ma-ọbu n'etiti ọb͕ọ-unu nile, mb͕e ọ gāru árú site na madu nwuru anwu, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ije di anya, ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga: 11n'ọnwa nke-abua n'ubọchi nke-iri-na-anọ n'etiti ehihie na anyasi ka ha gēme ya; tiyere achicha ekoghi-eko na ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya: 12ha agaghi-eme ka ihe fọdu site na ya rue ututu, ọ dighi kwa ọkpukpu ha gētiji nime ya: dika ukpuru nile nke ngabiga ahu si di ka ha gēme ya. 13Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya. 14Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.
15N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu. 16Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n'abali, n'ile ya anya. 17Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n'elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n'ebe igwe-oji ahu bi, n'ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha. 18N'okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n'elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū. 19Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije. 20Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije. 21Mb͕e ufọdu di kwa mb͕e igwe-oji ahu nānọ site n'anyasi rue ututu; ma mb͕e igwe-oji ahu rigoro n'ututu, ha we bulie ije: ma n'ehihie ma n'abali, mb͕e igwe-oji ahu rigoro, ha we bulie ije. 22Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu, ibi n'elu ya, umu Israel nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije. 23N'okwu-ọnu Jehova ha nāma ulo-ikwū-ha, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije: ihe-ndebe nke Jehova ka ha debere, n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 9: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in