YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 3

3
Abù Ọma Devid, mb͕e o siri n'iru Absalom nwa-ya b͕alaga.
1Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba!
Ọtutu madu nēbili imegidem.
2Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si,
Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.
3Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum,
Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.
4Ejim olum kpọkue Jehova,
O we zam site n'ugwu nsọ Ya.
5Mu onwem dinara ala, raru ura;
Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.
6M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta,
Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.
7Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem:
N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì;
I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.
8Jehova nwe nzọputa:
Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi. Selah

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for ABÙ ỌMA 3