ABÙ ỌMA 95
95
1Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù:
Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.
2Ka ayi were ekele bia n'iru Ya,
Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.
3N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu,
Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.
4Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya:
Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.
5Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;
Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.
6Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;
Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:
7N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi:
Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya.
Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,
8Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba,
Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:
9Mb͕e nna-unu-hà nwaram,
Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.
10Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọb͕ọ ahu oyi,
M'we si, Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu,
Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile:
11N'ihi ya aṅurum iyi n'iwem, si,
Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli
Currently Selected:
ABÙ ỌMA 95: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.