JENESIS 6

6
1O rue, mb͕e madu malitere iba uba n'elu ala, mb͕e amukwara umu-ndinyóm nye ha, 2na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara. 3Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi. 4Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha. 5Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile. 6Jehova we chegharia na O mere madu n'uwa, ọ we wute Ya n'obi-Ya. 7Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha. 8Ma Noa hutara amara n'iru Jehova.
9Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n'ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari. 10Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet. 11Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike. 12Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.
13Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa. 14Mere onwe-gi ub͕ọ nke osisi gopher; ulo-nwubi di iche iche ka i gēme n'ub͕ọ ahu, were kwa bitumen techie ya ime na azu. 15Nka bu kwa otú i gēme ya: ọgú cubit iri-na-ise ka ogologo ub͕ọ ahu bu, ọgu cubit abua na iri bu obosara-ya, orú cubit na iri bu idi-elu-ya. 16Oghere inye ìhè ka i gēmere ub͕ọ ahu, rue otù cubit ka i gēmesi kwa ya site n'elu; ọnu-uzọ ub͕ọ ahu ka i gētiye kwa n'akuku-ya; okpukpu nke-ala na nke-abua na nke-atọ ka i gēme ya. 17Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume. 18Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi. 19Ọ bu kwa ufọdu nime anu nile ọ bula nke di ndu, nime anu-aru nile, abua abua n'aha nile ọ bula, ka i gēme ka ha bata n'ub͕ọ, idebe ha ndu tiyere onwe-gi; oke na nwunye ka ha gābu. 20Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n'ala, abua abua n'aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu. 21Gi onwe-gi kwa, were n'onwe-gi ufọdu nime ihe-oriri nile nke anēri eri, gi chikọta ya n'ebe i nọ; ọ gāburu gi, bukwara ha, ihe-oriri. 22Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.

Одоогоор Сонгогдсон:

JENESIS 6: IGBOB

Тодруулга

Хуваалцах

Хувилах

None

Тодруулсан зүйлсээ бүх төхөөрөмждөө хадгалмаар байна уу? Бүртгүүлэх эсвэл нэвтэрнэ үү