Jọn Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Jọn bụ otu nʼime ndị ikom iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ Kraịst. Ihe o dere nʼakwụkwọ oziọma a bụ ihe na-egosi na Jisọs Kraịst bụ Chineke nʼezie, na ọ ghọrọ mmadụ nʼihi ịzọpụta ụmụ mmadụ. Akwụkwọ oziọma Jọn na-akọwara anyị ụdị ịhụnanya dị ukwuu Chineke nwere nʼebe mmadụ nọ. Ọ na-egosikwa anyị na ndụ ebighị ebi bụ nke mmadụ ahụ jiri obi ya kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Usoro e si dee ya:
Nkọwa mmalite banyere ụdịdị Jisọs Kraịst 1:1-18
Ọrụ mmalite dị iche iche 1:19–4:54
Ọrụ dị iche iche na Galili 5:1–10:42
Jisọs esite nʼọnwụ kpọlite Lazarọs 11
Mmalite ọgwụgwụ nke ọrụ Jisọs 12–13
Ozizi dị iche iche nke Jisọs 14–17
Ọnwụ na mbilite nʼọnwụ 18:1–20:10
Ngosi dị iche iche 20:11–21:25
Trenutno izabrano:
Jọn Ihe dị nʼime ya: BIU
Istaknuto
Podijeli
Kopiraj
![None](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapistaging.com%2F58%2Fhttps%3A%2F%2Fweb-assets.youversion.com%2Fapp-icons%2Fsr.png&w=128&q=75)
Želiš li da tvoje istaknuto bude sačuvano na svim tvojim uređajima? Kreiraj nalog ili se prijavi
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.