“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,
sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,
ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị
na ụbọchị nsọ ONYENWE ANYị ihe a na-akwanyere ugwu,
ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,
na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime ONYENWE ANYị,
m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ,
meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.”
Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYị ekwuola ya.