1
Abụ Ọma 30:5
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
Compare
Explore Abụ Ọma 30:5
2
Abụ Ọma 30:11-12
I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O ONYENWE ANYị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
Explore Abụ Ọma 30:11-12
3
Abụ Ọma 30:2
O ONYENWE ANYị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.
Explore Abụ Ọma 30:2
4
Abụ Ọma 30:4
Bụkuonụ ONYENWE ANYị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.
Explore Abụ Ọma 30:4
5
Abụ Ọma 30:1
Aga m eto gị, O ONYENWE ANYị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
Explore Abụ Ọma 30:1
Home
Bible
Plans
Videos