YouVersion Logo
Search Icon

II. IHE EMERE 10

10
1Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru ime ya eze. 2O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nọ n'Ijipt, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga,) na Jeroboam siri n'Ijipt lata. 3Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si, 4Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè. 5Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la. 6Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu? 7Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile. 8Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya. 9Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi? 10Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāsi ha, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam. 11Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. 12Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutenum n'ubọchi nke-atọ. 13Eze we za ha okwu ike; eze, bú Rehoboam, we rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, 14gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. 15Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo. 16Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n'ulo-ikwū-ha. 17Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha. 18Eze, bú Rehoboam, we ziga Hadoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; umu Israel we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ubọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem. 19Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.

Currently Selected:

II. IHE EMERE 10: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in