YouVersion Logo
Search Icon

II. IHE EMERE 9

9
1Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi. 2Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi kwa okwu ọ bula ezonariri Solomon nke ọ nēgosighi ya. 3Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe Solomon, na ulo nke o wuru, 4na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha; na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na uwe-ha; na nrigo-ya nke ọ nārigo n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ. 5O we si eze, Ezi-okwu ka ọ bu, bú okwu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi. 6Ma ekweghm okwu nile ha, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n'akukọ nke m'nuru. 7Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi. 8Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze-Ya, iburu Jehova, bú Chineke-gi, eze: n'ihi na Chineke-gi huru Israel n'anya, ime ka ha guzo rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume. 9O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche n'uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda di ka uda ahu nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon. 10Ọzọ kwa, ndi-orù Huram, na ndi-orù Solomon, ndi siri n'Ofia bubata ọla-edo, bubatara osisi algum na nkume di oké ọnu-ahia. 11Eze we were osisi algum ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ebe-njeghari di elu, o were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: akāhughi osisi dika osisi ahu n'ala Juda. 12Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o butere eze. O we chigharia, la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.
13Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n'otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi; 14nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia na ndi-ahia wetara: eze nile nke Arebia na ndi nāchi ala nēweta-kwa-ra Solomon ọla-edo na ọla-ọcha. 15Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù Shekel ọla-edo etisara etisa na ọgu iri bàra n'otù ọta uku. 16O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; ọgu shekel ọla-edo iri-na-ise bàra n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon. 17Eze me-kwa-ra oké oche-eze nnọdu ọdu, machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa. 18Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu. 19Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula. 20Ihe nile eze, bú Solomon, nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: agughi ọla-ọcha n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon. 21N'ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo. 22Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na amam-ihe. 23Eze nile nke uwa we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya. 24Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya. 25Solomon nwe-kwa-ra nnù ulo iri nke inyinya na ub͕ọ-ala, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala nile, na n'ebe eze nọ na Jerusalem. 26O we nāchi eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt. 27Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume nime Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba. 28Anēme kwa ka inyinya si n'Ijipt, si kwa n'ala nile, putara Solomon.
29Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n'ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat? 30Solomon we buru eze Israel nile nime Jerusalem ọgu arọ abua. 31Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Currently Selected:

II. IHE EMERE 9: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in