YouVersion Logo
Search Icon

JOB 39

39
1Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa?
Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?
2Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu?
Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?
3Ha nēruru ala, muputa umu-ha,
Tuzuga ihe-nb͕u-ha.
4Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia;
Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.
5Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya?
Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?
6Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya,
Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.
7Ọ nāchì ùzù obodo ọchì,
Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.
8Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya,
Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.
9Àtu gēkwe ibu orù-gi?
Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?
10Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi?
Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?
11Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?
Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?
12Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,
Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?
13Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;
Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?
14N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,
Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,
15O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,
Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.
16O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:
Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;
17N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,
O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.
18Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,
Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.
19Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?
Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?
20Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?
Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.
21Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya:
Ọ nāpu izute ihe-agha.
22Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ;
Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.
23Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya,
Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.
24Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala;
Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.
25Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe!
Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha,
Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.
26Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu,
B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di?
27Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu,
Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?
28N'elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali,
N'elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike.
29Site n'ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri;
Anya-ya abua nēsi n'ebe di anya legide ya.
30Umu-ya nāmicha kwa ọbara:
Ọzọ, ebe ndi eb͕uru eb͕u di, n'ebe ahu ka ọ nọ.

Currently Selected:

JOB 39: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in