YouVersion Logo
Search Icon

JOB 40

40
1Jehova we za Job, si,
2Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso
Onye puru ime ihe nile ọ̀gù?
Onye nābara Chineke nba, ya za ya.
3Job we za Jehova, si,
4Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi?
Atukwasiwom, akam, n'ọnum.
5Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa;
E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.
6Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,
7Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:
M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara.
8Ì nēmebi kwa ikpém?
I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?
9Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere?
Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?
10Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma;
Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.
11Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi:
Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.
12Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala;
Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.
13Zobekọ ha n'ájá;
Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.
14Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,
Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.
15Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;
Ọ nāta ahihia dika ehi.
16Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,
Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.
17Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:
Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.
18Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;
Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.
19Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:
Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.
20N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;
Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.
21N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,
N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.
22Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya;
Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.
23Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji:
Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.
24Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya?
Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?

Currently Selected:

JOB 40: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in