YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 21

21
1Onye Kenean, bú eze Arad, onye bi na Negeb, we nu na Israel abiawo n'uzọ Atarim; ọ we buso Israel agha, dọta ufọdu nime ha n'agha. 2Israel we kwere Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye ndi nka n'akam n'ezie, m'gēwezuga kwa obodo-ha nile ka ebibie ha. 3Jehova we ge nti n'olu Israel, nye ndi Kenean n'aka-ha; ha we wezuga ha na obodo nile ha ka ebibie ha: ewe kpọ aha ebe ahu Họma.
4Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu. 5Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé. 6Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel. 7Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel. 8Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya. 9Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya. 10Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot. 11Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu. 12Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered. 13Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait. 14N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova,
Vaheb nime Sufa,
Na ndagwurugwu nile nke Anon,
15Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu,
Bú nke nēwezuga onwe-ya n'uzọ ebe-obibi A,
Nke nādabere kwa n'ókè-ala Moab.
16Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri.
17Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si:
Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya:
18Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya,
Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya,
Ha ji nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n'aka nile ha, me ya.
Ha si n'ọzara ahu jerue Matana: 19si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot: 20si na Bamot jerue ndagwurugwu ahu nke di n'ọhia Moab, rue elu Pisga, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.
21Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si, 22Ka m'gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n'ọhia, ma-ọbu n'ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n'uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi. 23Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha. 24Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike. 25Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n'obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile. 26N'ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n'aka-ya, rue Anon. 27N'ihi ya ndi nātu ilu nāsi,
Banu nime Heshbon,
Ka ewue obodo Saihon, ka eguzosi kwa ya ike:
28N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua,
Ire-ọku n'obodo Saihon:
O ripiawo A nke Moab,
Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon.
29Ahuhu gādiri gi, Moab!
I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh:
Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu,
Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha,
N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.
30Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon,
Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa,
Nke diruru Medeba.
31Israel we biri n'ala ndi-Amorait. 32Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha. 33Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei. 34Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n'ihi na ọ bu n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon. 35Ha we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru arapuru ya: ha we nweta ala-ya.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 21: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in