YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 23

23
1Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a. 2Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula. 3Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi. 4Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula. 5Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu. 6Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile. 7O we tua ilu-ya, si,
N'Eram ka Belak nēsi dutem,
Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si,
Bia, buaram Jekob ọnu,
Bia kwa, wesa Israel iwe.
8Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi.
Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.
9N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,
Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:
Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,
Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.
10Ònye gutaworo ájá Jekob,
Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel?
Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,
Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!
11Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku. 12Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu? 13Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu. 14Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula. 15Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu. 16Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu. 17Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo? 18Ọ we tua ilu-ya, si,
Bilie, Belak, nuru kwa;
Ṅam nti, nwa Zipoa:
19Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha;
Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha:
Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya?
Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?
20Le, ọ bu igọzi ka m'nataworo iwu:
Ọ gọziwo kwa, apughkwam itughari ya.
21O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob,
Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel:
Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya,
Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha.
22Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta;
Ume dika ume atu ka ọ nwere
23N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob,
Iju-ase adighi kwa megide Israel:
Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si,
Le ihe Chineke meworo!
24Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum,
Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya:
Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara,
Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.
25Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli. 26Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēme? 27Belak we si Belam, Biko, bia, m'gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n'anya Chineke ka i si n'ebe ahu kọcharam ha. 28Belak we kuru Belam je n'elu Peoa, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di. 29Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a. 30Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 23: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in