YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 8

8
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Gittith. Abù Ọma Devid.
1Jehova, Onye-nwe-ayi,
Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!
Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé.
2I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike,
N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi,
Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.
3Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,
Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;
4Gini ka madu bu, na I nēcheta ya;
Na nwa nke madu, na I nēleta ya?
5I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke,
I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze.
6I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua;
Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:
7Ewu na aturu na ehi, ha nile,
Ha na anu ọhia;
8Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri,
Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile.
9Jehova, Onye-nwe-ayi,
Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 8: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for ABÙ ỌMA 8